Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 27:26-37 Bible Nso (IGBOB)

26. Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe.

27. Mb͕e ahu ndi-agha nke onye-isi kuru Jisus tiyere onwe-ha ba na Pritoriọm, ha we me ka òtù-ha dum zukọ n'ebe Ọ nọ.

28. Ha we yipu uwe-Ya, yikwasi Ya uwe uhie.

29. Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, nye kwa Ya amì n'aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n'iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju!

30. Ha busa-kwa-ra Ya ọnu-miri, were kwa amì ahu nēti Ya n'isi.

31. Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ahu, yikwasi Ya uwe-Ya nile, dupuga Ya ikpọgide Ya n'obe.

32. Ma mb͕e ha nāputa, ha huru otù nwoke onye Sairini, aha-ya bu Saimon: onye ahu ka ha jidere ka o so ha, ka o we būru obe-Ya.

33. Mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, Ebe okpokoro-isi,

34. ha we nye Ya manya-vine nke agwara òlùlù ka Ọ ṅua: ma mb͕e O deturu ya ire, Ọ chọghi ka Ọ ṅua.

35. Mb͕e ha kpọgidesiri Ya n'obe, ha kère uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà: ka o wee mezuo bụ ihe si n'ọnụ onye amụma Pita, Ha nēkere onwe-ha uwem, n'elu bụ ihe m n'eyi n'aru ka ha nēfe kwa nza.

36. ha we nọdu nēche Ya n'ebe ahu.

37. Ha debe-kwa-ra n'elu isi-Ya ihe eboro Ya nke edeworo n'akwukwọ, si, ONYE A BU JISUS EZE NDI-JU.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 27