Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 26:19-27 Bible Nso (IGBOB)

19. Ndi nēso uzọ-Ya we me dika Jisus nyere ha iwu; ha we dozie ememe ngabiga.

20. Ma mb͕e o ruru anyasi, Ya na ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya nọduru na nri;

21. mb͕e ha nēri ihe, Ọ si, N'ezie asim unu, na otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye.

22. O we wuta ha ri nne, ha nile n'otù n'otù we malite isi Ya, Ọ̀ bu mu, Onye-nwe-ayi?

23. Ma Ọ zara, si, Onye nke Mu na ya sukọrọ aka n'afere, onye ahu gāraram nye.

24. Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.

25. Judas, onye nārara ya nye, we za, si, Ọ̀ bu mu, Rabai? Ọ si ya, Gi onwe-gi kwuru.

26. Mb͕e ha nēri ihe, Jisus we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya; O we nye ndi nēso uzọ-Ya, si, Naranu, rie; nka bu arum.

27. O we nara iko, kele kwa, we nye ha, si, Unu nile ṅua nime ya;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 26