1. O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia nile, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,
2. Unu matara na mb͕e ubọchi abua gasiri ememe ngabiga nābia, arara kwa Nwa nke madu nye ka akpọgide Ya n'obe.
3. Mb͕e ahu ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ n'obí onye-isi-nchu-àjà, onye anākpọ Kaiafas;
4. ha we b͕akọ ìzù ka ha we were aghughọ jide Jisus, b͕ue Ya.
5. Ma ha siri, Ọ bughi n'ememe a, ka ùzù we ghara iputa n'etiti ndi-Ju.
6. Ma mb͕e Jisus nọ na Betani, n'ulo Saimon onye-ekpenta,
7. otù nwanyi biakutere Ya nke nēji ite alabaster, nke manu-otite di oké ọnu-ahia nke-uku di ya, o we wusa manu-otite ahu n'isi-Ya, mb͕e Ọ nọduru na nri.
8. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, iwe were ha nke-uku, ha si, Èji ila-n'iyì nka me gini?
9. N'ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye.
10. Ma mb͕e Jisus mara ya, Ọ si ha, Gini mere unu nēsob͕u nwanyi a? n'ihi na ọ luru ọlu ọma n'arum.
11. N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile.
12. N'ihi na n'iwusi manu-otite a n'arum, o mere ya ka o we doziem n'olìlì.