Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 24:40-49 Bible Nso (IGBOB)

40. Mb͕e ahu madu abua gānọ n'ubì; ewere otù, rapu kwa otù:

41. ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù.

42. Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia.

43. Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya.

44. N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.

45. Ònye kwa bu orù ahu kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya mere onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha ihe eji azù ha n'oge-ya?

46. Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.

47. N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.

48. Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n'obi-ya, Onye-nwem nānọ ọdù di anya;

49. ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù-ibe-ya aka, so kwa ndi nāṅubiga manya ókè nēri nāṅu kwa;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 24