Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 24:31-46 Bible Nso (IGBOB)

31. Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site n'otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ.

32. Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;

33. otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia nile, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzọ.

34. N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.

35. Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.

36. Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amataghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.

37. Ọ bu kwa dika ubọchi Noa diri, otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.

38. N'ihi na dika ha nọ na mb͕e ahu nke bū oké iju-miri ahu uzọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nālu nwunye, nēnye kwa n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya,

39. ha amaghi kwa rue mb͕e oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile; otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi.

40. Mb͕e ahu madu abua gānọ n'ubì; ewere otù, rapu kwa otù:

41. ndinyom abua ganēgwe nri na nkume-igwe-nri; ewere otù, rapu kwa otù.

42. Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi ubọchi Onye-nwe-unu gābia.

43. Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche, ọ gaghi-ekwe kwa ka egwupú ulo-ya.

44. N'ihi nka unu onwe-unu buru kwa ndi edoziworo: n'ihi na n'oge hour nke unu nēchèghi ka Nwa nke madu gābia.

45. Ònye kwa bu orù ahu kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya mere onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha ihe eji azù ha n'oge-ya?

46. Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 24