Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 18:24-35 Bible Nso (IGBOB)

24. Ma mb͕e ọ malitere ipiazi, ewe kutara ya otù onye, nke ji ya orú nnù talent na nnù ise.

25. Ma ebe o nweghi ihe o gēji kwughachi, onye-nwe-ya siri ka ere ya, na nwunye-ya, na umu-ya, na ihe nile o nwere, ka ha ra, ka akwughachi kwa ugwọ.

26. Ya mere orù ahu dara n'ala nākpọ isi ala nye ya, si, Onye-nwe-ayi, nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi ihe nile.

27. Ma ebe onye-nwe orù ahu nwere ọmiko n'aru ya, ọ rapu ya, b͕aghara kwa ya ihe ahu o binyere ya-ri.

28. Ma orù ahu puru, hu otù nime ndi-orù-ibe-ya, nke ji ya ọgu shilling ise: o we jidesie ya aka ike, ri ya aka n'akpiri, si, Kwughachim ihe i ji.

29. Ya mere orù-ibe-ya dara n'ala, riọ ya, si, Nwe ogologo-ntachi-obi n'arum, na m'gākwughachi gi.

30. Ma ọ chọgh: kama o jere tubà ya n'ulo-nkpọrọ, rue mb͕e ọ gākwughachi ihe o ji.

31. Ya mere mb͕e ndi-orù-ibe-ya huru ihe emere, o wuta ha ri nne n'obi, ha we bia kọrọ onye-nwe-ha ihe nile mere.

32. Mb͕e ahu onye-nwe-ya kpọrọ ya biakute ya, si ya, Ajọ orù, ab͕agharam i ugwọ ahu nile, n'ihi na i riọrọm:

33. ọ̀ kwesighi kwa gi imere orù-ibe-gi ebere ọbuná dika mu onwem mere gi ebere?

34. Onye-nwe-ya were iwe, we rara ya nye n'aka ndi-nmekpa-aru, rue mb͕e ọ gākwughachi ugwọ nile o ji.

35. Otú a ka Nnam nke elu-igwe gēme kwa unu, ọ buru na unu ab͕agharaghi, onye ọ bula nmehie nwa-nne-ya, site n'obi-unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 18