Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 14:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. N'oge ahu Herod, bú tetrarch, nuru akukọ Jisus,

2. o we si ndi nējere ya ozi, Nwoke a bu Jọn Baptist; o siwo na ndi nwuru anwu bilie; n'ihi nka ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya.

3. N'ihi na Herod jidereri Jọn, we ke ya ab͕u, tiye ya n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya.

4. N'ihi na Jọn nāsi ya, O zighi gi ezi n'iwu inwe ya dika nwunye.

5. Ọ bu ezie na ọ chọrọ ib͕u kwa ya, ma ọ turu egwu ọra ndi-Ju, n'ihi na ha guru ya n'onye-amuma.

6. Ma mb͕e ncheta ọmumu Herod ruru, nwa-nwanyi Herodias tere egwú n'etiti, o we tọ Herod utọ.

7. N'ihi ya o were iṅu-iyi kwe nkwa inye ya ihe ọ bula ọ gāriọ.

8. Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a.

9. O we wuta eze ahu n'obi: ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi ya na ha nọduru na nri, o nyere iwu ka ewere ya nye ya;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 14