1. N'oge ahu Herod, bú tetrarch, nuru akukọ Jisus,
2. o we si ndi nējere ya ozi, Nwoke a bu Jọn Baptist; o siwo na ndi nwuru anwu bilie; n'ihi nka ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya.
3. N'ihi na Herod jidereri Jọn, we ke ya ab͕u, tiye ya n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya.
4. N'ihi na Jọn nāsi ya, O zighi gi ezi n'iwu inwe ya dika nwunye.
5. Ọ bu ezie na ọ chọrọ ib͕u kwa ya, ma ọ turu egwu ọra ndi-Ju, n'ihi na ha guru ya n'onye-amuma.