Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 13:2-7 Bible Nso (IGBOB)

2. Oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ótú.

3. O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru;

4. mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha:

5. nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi:

6. ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.

7. Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 13