17. N'ihi na n'ezie asim unu, na agu guru ọtutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha.
18. Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke ọgha-nkpuru ahu.
19. Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ.
20. Onye agha-kwa-ra n'ebe nkume ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu, ngwa ngwa o were ọṅù jide ya;
21. ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n'ọnyà.
22. Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.
23. Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n'ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.
24. O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mb͕e ọ ghara nkpuru ọma n'ubi-ya:
25. ma mb͕e madu nāraru ura, onye-iro-ya biara we gha kwa ata n'etiti ọka, we la.
26. Ma mb͕e npute puru, we mia nkpuru, mb͕e ahu ata ahu puta-kwa-ra ìhè.