Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 13:1-8 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ubọchi ahu Jisus puru n'ulo, we nọdu n'usọ oké osimiri.

2. Oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ótú.

3. O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru;

4. mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha:

5. nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi:

6. ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.

7. Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha.

8. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 13