Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 12:27-39 Bible Nso (IGBOB)

27. Ọ buru kwa na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ìke onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.

28. Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Mọ nke Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.

29. Ma-ọbu màdu gēsi aṅa pu ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u? mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.

30. Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.

31. N'ihi nka ka M'ji si unu, Agāb͕aghara madu nmehie na nkwulu ọ bula; ma agaghi-ab͕aghara nkwulu ekwuluru Mọ Nsọ.

32. Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya; ma onye ọ bula nke gēkwu megide Mọ Nsọ, agaghi-ab͕aghara ya, ọ bughi n'oge a, ọ bughi kwa n'oge nke gaje ibia.

33. Menu osisi ka ọ di nma, menu nkpuru-ya ka ọ di kwa nma; ma-ọbu menu osisi ka ọ buru osisi nābaghi n'ihe, menu nkpuru-ya ka ọ buru kwa nkpuru nābaghi n'ihe: n'ihi na amara osisi site na nkpuru-ya.

34. Umu nke aju-ala, ùnu gēsi aṅa pu ikwu ezi ihe, ebe unu bu ajọ madu? n'ihi na ọnu site n'ihe nke obi nwebigara ókè nēkwu okwu.

35. Ezi madu nēsi n'ezi àkù-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n'ajọ àkù-ya atuputa ajọ ihe.

36. Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé.

37. N'ihi na agēsite n'okwu-ọnu-gi nile gu gi n'onye ezi omume, agēsite kwa n'okwu-ọnu-gi nile kpeb͕u gi.

38. Mb͕e ahu ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi zara Ya, si, Onye-ozizí, ayi nāchọ ihu ihe-iriba-ama site n'aka-Gi.

39. Ma Ọ zara, si ha, Ajọ ọb͕ọ nke nākwa kwa iko nāchọ ihe-iriba-ama; agaghi-enye kwa ya ihe-iriba-ama ma-ọbughi ihe-iriba-ama nke Jona onye-amuma:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 12