Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 12:20-36 Bible Nso (IGBOB)

20. Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia,Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku,Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri.

21. Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.

22. Mb͕e ahu ekutara Ya otù onye mọ ọjọ ji, bú onye kpuru ìsì nke da-kwa-ra ob͕i: O we me ka aru-ya di ike, ya mere onye-ob͕i ahu kwuru okwu hu kwa uzọ.

23. Ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile n'aru, ha we si, Nwoke a, Ọ̀ gābu nwa Devid?

24. Ma mb͕e ndi-Farisi nuru ya, ha si, Nwoke a adighi-achupu ndi-mọ ọjọ, ma-ọbughi n'ike Beelzebul onye-isi ndi-mọ ọjọ ahu.

25. Ma ebe Ọ matara ihe di ha n'obi Ọ si ha, Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agaghi-eguzo:

26. Ọ buru kwa na Setan achupu Setan, o kewara megide onwe-ya; àla-eze-ya gēsi kwa aṅa guzo?

27. Ọ buru kwa na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Beelzebul, n'ìke onye ka umu-unu ndikom nāchupu ha? n'ihi nka ha gābu ndi-ikpé-unu.

28. Ma ọ buru na Mu onwem achupu ndi-mọ ọjọ n'ike Mọ nke Chineke, ya mere ala-eze Chineke ruru unu aru.

29. Ma-ọbu màdu gēsi aṅa pu ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u? mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.

30. Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.

31. N'ihi nka ka M'ji si unu, Agāb͕aghara madu nmehie na nkwulu ọ bula; ma agaghi-ab͕aghara nkwulu ekwuluru Mọ Nsọ.

32. Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya; ma onye ọ bula nke gēkwu megide Mọ Nsọ, agaghi-ab͕aghara ya, ọ bughi n'oge a, ọ bughi kwa n'oge nke gaje ibia.

33. Menu osisi ka ọ di nma, menu nkpuru-ya ka ọ di kwa nma; ma-ọbu menu osisi ka ọ buru osisi nābaghi n'ihe, menu nkpuru-ya ka ọ buru kwa nkpuru nābaghi n'ihe: n'ihi na amara osisi site na nkpuru-ya.

34. Umu nke aju-ala, ùnu gēsi aṅa pu ikwu ezi ihe, ebe unu bu ajọ madu? n'ihi na ọnu site n'ihe nke obi nwebigara ókè nēkwu okwu.

35. Ezi madu nēsi n'ezi àkù-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n'ajọ àkù-ya atuputa ajọ ihe.

36. Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābaghi n'ihe, ha gāza ajuju bayere ya n'ubọchi ikpé.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 12