Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 12:1-19 Bible Nso (IGBOB)

1. N'oge ahu Jisus gara n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ma agu nāgu ndi nēso uzọ-Ya, ha we malite ighọ oko ọka, na ita ya.

2. Ma ndi-Farisi, mb͕e ha huru ya, ha si Ya, Le, ndi nēso uzọ-Gi nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike.

3. Ma Ọ siri ha, Ùnu agughi ihe Devid mere, mb͕e agu guru ya, na ndi soro ya;

4. otú ọ batara n'ulo Chineke, rie ob͕e achicha anēche n'iru Chineke, nke nēzighi ezi n'iwu ka o rie, ma-ọbu ndi so ya, kama ọ bu nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi?

5. Ma-ọbu ùnu agughi n'iwu, na ndi-nchu-àjà nēmeru ubọchi-izu-ike n'ulo uku Chineke n'ubọchi-izu-ike, ma adighi-ata ha uta?

6. Ma asim unu, na Onye di uku kari ulo Chineke nọ n'ebe a.

7. Ma ọ buru na unu marari ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà, unu agaghi-ekpeb͕u ndi adighi-ata ha uta.

8. N'ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.

9. O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo-nzukọ-ha:

10. ma le, otù nwoke nke nwere aka kpọnwuru akpọnwu. Ha we jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike? ka ha we bo Ya ebubo.

11. ma Ọ siri ha, Òle madu gādi n'etiti unu, nke gēnwe otù aturu, ma ọ buru na aturu ahu adabà nime olùlù n'ubọchi-izu-ike, ọ̀ gaghi-ejide ya, dọgoputa ya?

12. Òle kwa ka ọ ra, bú otú ọnu-ahia madu kariri nke aturu oké ọnu! Ya mere o ziri ezi n'iwu ime ihe ọma n'ubọchi-izu-ike.

13. Mb͕e ahu Ọ si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya; ewe me ka aka-ya di nma, dika nke-ọzọ.

14. Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.

15. Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike,

16. O we dọ ha aka na nti ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè:

17. ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,

18. Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara;Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma:M'gātukwasi Ya Mọ nkem,Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé.

19. Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike;Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n'amá.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 12