Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 11:4-13 Bible Nso (IGBOB)

4. Jisus we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu nānu na nke unu nāhu:

5. ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi-ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma.

6. Ngọzi nādi-kwa-ra onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.

7. Ma mb͕e ndia nāla, Jisus malitere igwa ìgwè madu nile okwu bayere Jọn, si, Ọ̀ bu gini ka unu puru je n'ọhia ka unu kiri? àmì nke nēme nkpatu site n'ifufe?

8. Ma ọ̀ bu gini ka unu puru ka unu hu? ǹwoke eyikwasiworo uwe di biali-biali? Le, ndi nēyi uwe di biali-biali nọ n'ulo ndi-eze.

9. Ma gini mere unu ji pua? ìhu onye-amuma? E, asim unu, onye kari kwa onye-amuma nke-uku.

10. Nwoke a bu onye edeworo ihe n'akwukwọ nsọ bayere ya, si,Le, Mu onwem nēziga onye-ozim n'iru Gi,Onye gēmezi uzọ-Gi n'iru Gi.

11. N'ezie asim unu, N'etiti ndi ndinyom muru ọ dighi onye biliworo nke ka Jọn Baptist uku: ma onye dikariri ntà n'ala-eze elu-igwe ka ya uku.

12. Site n'ubọchi Jọn Baptist rue ub͕u a anēme kwa ala-eze elu-igwe ihe-ike, ndi nēme ihe-ike nāpunara ya.

13. N'ihi na ndi-amuma nile na iwu Chineke buru amuma rue ubọchi Jọn.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 11