Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Matiu 1:18-25 Bible Nso (IGBOB)

18. Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ.

19. Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n'iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo.

20. Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ.

21. Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha.

22. Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,

23. Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke,Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel;nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.

24. Josef we si n'ura-ya bilie, me dika mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nyere ya iwu, we kuru nwunye-ya;

25. ọ maghi kwa ya rue mb͕e ọ muputara Nwa-nwoke: o we kpọ aha-Ya Jisus.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Matiu 1