Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 9:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Ewe me ka ha hu Elaija na Moses: ha na Jisus nēkwurita kwa okwu.

5. Pita we za, si Jisus, Rabai, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Elaija.

6. N'ihi na ọ maghi ihe ọ gāza; n'ihi na ha nātu oké egwu.

7. Igwe-oji we bia kpuchie ha: olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya: nurunu okwu-Ya.

8. Na mberede, mb͕e ha lere anya buruburu, ha ahughi onye ọ bula ọzọ, ma-ọbughi nání Jisus, Ya na ha.

9. Mb͕e ha si n'ugwu ahu nārida, O we gwasie ha ike ka ha ghara ikọrọ onye ọ bula ihe ha hururi, ma-ọbughi mb͕e Nwa nke madu gēsiwori na ndi nwuru anwu bilie.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 9