Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 9:34-43 Bible Nso (IGBOB)

34. Ma ha kpuchiri ọnu-ha: n'ihi na ha nārurita uka n'uzọ onye ka ibe-ya n'etiti ha.

35. Ọ we nọdu ala, kpọ ndi-ozi iri na abua ahu; O we si ha, Ọ buru na onye ọ bula nācho ka ọ buru onye-isi, ọ gābu onye-ikpe-azu n'etiti unu nile, na onye nējere unu nile ozi.

36. O we kuru nwatakiri debe ya n'etiti ha: mb͕e O kusiri ya n'aka-Ya, Ọ si ha,

37. Onye ọ bula nke gānara otù nime umu-ntakiri di otú a n'aham nke-ọma, ọ bu Mu onwem ka Ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma, ọ bughi Mu ka ọ nānara nke-ọma, kama ọ bu Onye ziterem.

38. Jọn siri Ya, Onye-ozizí, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi: ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi.

39. Ma Jisus siri, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na ọ dighi onye ọ bula nke gālu ọlu di ike n'aham, nke gāpu kwa ikwujọm ọsọsọ.

40. N'ihi na onye nādighi-emegide ayi diri ayi.

41. N'ihi na onye ọ bula nke gēkuru otù iko miri nye unu ṅua, n'ihi na unu bu ndi nke Kraist, n'ezie asim unu, na ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli.

42. Ọzọ, onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwerenu ka ọ ma n'ọnyà, ọ gāka ya nma ma ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, tubà ya n'oké osimiri.

43. Ọzọ ọ buru na aka-gi eme gi ka i ma n'onyà, bipu ya: o di gi nma ibà na ndu n'ọlusi, kari inwe aka-gi abua ba n'ọku ala-mọ, n'ọku anyughi-anyu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 9