Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 9:30-35 Bible Nso (IGBOB)

30. Ha we si n'ebe ahu pua, gabiga n'etiti Galili; Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara.

31. N'ihi na Ọ nēzí ndi nēso uzọ-Ya ihe, si ha, Anārara Nwa nke madu nye n'aka madu, ha gēb͕u kwa Ya; mb͕e eb͕usiri Ya, Ọ gēsi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.

32. Ma ha aghọtaghi okwu ahu, ha nātu kwa egwu iju Ya.

33. Ha we bia rue Kapanaum: mb͕e Ọ nọ, n'ulo-ha O we jua ha, si, Gini ka unu nēkwurita n'uzọ?

34. Ma ha kpuchiri ọnu-ha: n'ihi na ha nārurita uka n'uzọ onye ka ibe-ya n'etiti ha.

35. Ọ we nọdu ala, kpọ ndi-ozi iri na abua ahu; O we si ha, Ọ buru na onye ọ bula nācho ka ọ buru onye-isi, ọ gābu onye-ikpe-azu n'etiti unu nile, na onye nējere unu nile ozi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 9