7. Ha nwe-kwa-ra azù ntà ole-na-ole: O we gọzie ha, si ka edebe kwa ndia n'iru ha.
8. Ha we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ iberibe fọduru, abọ asa.
9. Ma ndi ahu ra ka nnù iri: O we zilaga ha.
10. Ngwa ngwa Ya na ndi nēso uzọ-Ya we ba n'ub͕ọ-ha, bia n'akuku Dalmanuta.
11. Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'inwa Ya.
12. O we sua udè nke-uku na mọ-Ya, si, Gini mere ọb͕ọ a nāchọ ihe-iriba-ama? n'ezie asim unu, Agaghi-enye ọb͕ọ a ihe-iriba-ama.
13. O we rapu ha, ba kwa n'ub͕ọ ọzọ, we gabiga n'ofè ọzọ.