Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 8:3-15 Bible Nso (IGBOB)

3. ọ buru kwa na ezilagam ha n'ulo-ha n'ọnu efu, ha gāda #mbà n'uzọ; ufọdu nime ha si kwa n'ebe di anya bia.

4. Ndi nēso uzọ-Ya we za Ya, si, Ọle ebe ka madu gēsi pu inwe ob͕e achicha inyeju ndia afọ nime ọhia ebe a?

5. O we jua ha, si, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa.

6. O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala: O we nara ob͕e achicha asa ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ka ha debe n'iru ha; ha we debe ha n'iru ìgwè madu ahu.

7. Ha nwe-kwa-ra azù ntà ole-na-ole: O we gọzie ha, si ka edebe kwa ndia n'iru ha.

8. Ha we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ iberibe fọduru, abọ asa.

9. Ma ndi ahu ra ka nnù iri: O we zilaga ha.

10. Ngwa ngwa Ya na ndi nēso uzọ-Ya we ba n'ub͕ọ-ha, bia n'akuku Dalmanuta.

11. Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'inwa Ya.

12. O we sua udè nke-uku na mọ-Ya, si, Gini mere ọb͕ọ a nāchọ ihe-iriba-ama? n'ezie asim unu, Agaghi-enye ọb͕ọ a ihe-iriba-ama.

13. O we rapu ha, ba kwa n'ub͕ọ ọzọ, we gabiga n'ofè ọzọ.

14. Ha we chezọ iwere ob͕e achicha; ha enweghi kwa n'aka-ha nime ub͕ọ ihe kariri otù ob͕e achicha.

15. O we gwasie ha ike, si, Nēlenu anya, lezienu anya ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, na ihe Herod, bú ihe nēko achicha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 8