Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 8:16-28 Bible Nso (IGBOB)

16. Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ bu n'ihi na ayi enweghi ob͕e achicha.

17. Ebe Jisus mara ya Ọ si ha, Gini mere unu nēkwurita n'onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha? ùnu akātugharighi uche, ùnu akāghọtaghi kwa? èmere obi-unu etili?

18. Unu ahughi uzọ mb͕e unu nwere anya? ùnu anughi kwa ihe mb͕e unu nwere nti? ùnu echetaghi kwa?

19. Mb͕e M'nyawara ob͕e achicha ise nye nnù madu iri na nnù abua na ọgu iri, ǹkata ole juputara n'iberibe ka unu bulitere? Ha si Ya, Iri na abua.

20. Mb͕e M'nyawara asa nye nnù madu iri, ìberibe juputara abọ ole ka unu tutukọrọ? Ha we si Ya, Asa.

21. O we si ha, Ùnu akāghọtaghi?

22. Ha we bía na Betsaida. Ha we kutara Ya onye-ìsì, riọ Ya ka O metu ya aka.

23. O we jide onye-ìsì ahu n'aka, duputa ya n'obodo ntà ahu; mb͕e Ọ busara ya ọnu-miri n'anya, bikwasi kwa ya aka-Ya abua, O we jua ya, si, Ọ̀ di ihe i huru?

24. O we le anya n'elu, si, Ahurum madu; n'ihi na ahurum ha dika osisi, ha nējeghari.

25. Mb͕e ahu O bikwasiri aka-Ya abua n'anya-ya ọzọ; o we legide anya, eme kwa ka anya-ya di ka ha di na mbu, o we hucha ihe nile.

26. O we zilaga ya n'ulo-ya, si, Abàla ọbuná n'obodo ntà nke à.

27. Jisus we pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, ba n'obodo ntà nile nke Sisaria Filipi: mb͕e ha nọ n'uzọ O we jua ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Onye ka madu nāsi na Mu onwem bu?

28. Ha we gwa Ya, si, Jọn Baptist: ndi ọzọ si kwa, Elaija; ma ndi ọzọ si, Otù nime ndi-amuma.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 8