Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 7:11-28 Bible Nso (IGBOB)

11. ma unu onwe-unu nāsi, Ọ buru na madu si nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu Kọban, isi-ya bu, Ihe enyere Chineke;

12. unu ekweghi ya ọzo ka o mere nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe ọ bula:

13. nēme okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu site n'ozizí enyere unu n'aka idebe, nke unu nyere madu n'aka idebe: ọtutu ihe di otú a ka unu nēme kwa.

14. O we kpọ ìgwè madu ahu ọzọ biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu okwum, unu nile, ghọta-kwa-nu:

15. ọ dighi ihe ọ bula di madu n'ìhè nke puru imeru ya, ma ọ buru na ọ ba nime ya: kama ihe si nime madu puta bu ihe nēmeru madu.

16. Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.

17. Mb͕e Ọ ghara ìgwè madu ahu ba n'ulo, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya isi ilu ahu.

18. O we si ha, Ùnu onwe-unu di kwa otú a ka ndi nēnweghi nghọta? Ùnu atugharighi uche-unu, na ihe ọ bula nke si n'ìhè ba nime madu, na ọ pughi imeru ya,

19. n'ihi na ọ bàghi n'obi-ya, kama n'afọ-ya, o we pua n'ulo-ǹsí? O kwuru nka, ka O me ka ihe-oriri nile di ọcha.

20. O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu.

21. N'ihi na n'ime, bú n'obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile,

22. ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche:

23. ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.

24. O we si n'ebe ahu bilie, je n'ókè-ala Taia na Saidon. O we ba n'ulo, Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara: ma apughi izota Ya.

25. Ma ngwa ngwa otù nwanyi, nke nwa-ya nwanyi nke-ntà nwere mọ nādighi ọcha, ebe ọ nuru ùdé-Ya, ọ bia da n'ala n'ukwu-Ya.

26. Ma nwanyi ahu bu onye-Grik, buru onye Sairo-Finisia n'ọmumu-ya. O we kpere Ya ka Ọ chupu mọ ọjọ ahu n'aru nwa-ya nwanyi.

27. O we si ya, Kwe ka afọ buru uzọ ju umu: n'ihi na ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita.

28. Ma ọ zara, si Ya, E, Onye-nwe-ayi: ọbuná umu-nkita n'okpuru table nēri irighiri ufọdu na nri umu ntà.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 7