Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 6:48-56 Bible Nso (IGBOB)

48. Mb͕e Ọ huru ha ka ha nādọb͕u onwe-ha n'ọnyinya-ub͕o-ha, n'ihi na ifufe nēfegide ha, O we biakute ha dika nche nke-anọ n'abali, nēje ije n'elu oké osimiri; O we chọ igabiga ha:

49. ma mb͕e ha huru Ya ka Ọ nēje ije n'elu oké osimiri, ọ di ha ka Ọ bu mọ, ha we tisie nkpu ike:

50. n'ihi na ha nile huru Ya, obi we lọ ha miri. Ma Ọ kpayere ha uka ngwa ngwa, si ha, Nwenu obi-ike: ọ bu Mu; unu atula egwu.

51. O we rigokuru ha n'ub͕ọ; ifufe we febìe: ibobo we nwubiga ha ókè n'aru ri nne n'onwe-ha;

52. n'ihi na ha aghọtaghi ọlu ebube nke ob͕e achicha ise, kama emereri ka obi-ha me etili.

53. Mb͕e ha gabigasiri, ha bia rue ala rue Genesaret, tinye ub͕ọ-ha n'ala.

54. Mb͕e ha putara n'ub͕ọ, ngwa ngwa ọra we mazu Ya,

55. we b͕aghari n'ala ahu dum, malite ibughari ndi aru nādighi nma n'ute-ha, n'ebe ha nuru na Ọ nọ.

56. Ebe ọ bula Ọ batara, n'obodo ntà, ma-ọbu n'obodo, ma-ọbu n'ubi, ha we nātọb͕ọ ndi aru-ha nādighi ike n'ọma-ahia, ha nāriọ kwa Ya ka ha metu ọbuná ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ewe zọputa ha, ka ha ra, bú ndi meturu Ya aka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 6