Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 6:16-34 Bible Nso (IGBOB)

16. Ma mb͕e Herod nuru ya, ọ si, Jọn, onye mu onwem bipuru isi-ya, emere onye ahu ka o si n'ọnwu bilie.

17. N'ihi na Herod onwe-ya zipururi jide Jọn, we ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya: n'ihi na ọ luru ya na nwunye.

18. N'ihi na Jọn nāsi Herod, O zighi gi ezi n'iwu inwe nwunye nwa-nna-gi.

19. Ma Herodias dobere ya iwe n'obi, ọ chọ-kwa-ra ib͕u ya; ma ọ pughi;

20. n'ihi na Herod nātu egwu Jọn, ebe ọ matara na ọ bu nwoke nke bu onye ezi omume na onye di nsọ, ọ nēdebe kwa ya nke-ọma. Ọzọ, mb͕e ọ nuru okwu-ya, ọ nēchè uche nke-uku; o were kwa obi-utọ nānu ya.

21. Ma mb͕e ubọchi di oghere ruru, mb͕e Herod siri nri-anyasi na ncheta-ọmumu-ya nye ndi-amadi-ya, na ndi-ọchi-agha, na ndi-isi nke Galili;

22. mb͕e nwa-nwanyi Herodias onwe-ya bata-kwa-ra, te egwú, o we tọ ha utọ, bú Herod na ndi ya na ha nānọdu na nri; eze we si nwa-ab͕ọghọ ntà ahu, Riọm ihe ọ bula i nāchọ, na m'gēnye gi ya.

23. O we ṅuara ya iyi, si, Ihe ọ bula i gāriọm, m'gēnye gi ya, rue nkera nke ala-ezem.

24. O we pua, si nne-ya, Gini ka m'gāriọrọ onwem? O we si, Isi Jọn onye nēme baptism.

25. O were ọsọ bata ngwa ngwa n'ebe eze ahu nọ, we riọ, si, Anamachọ ka i nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa ub͕u a.

26. O we wuta eze ahu n'obi nke-uku; ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi nọduru na nri, ọ chọghi iju ya.

27. Ngwa ngwa eze we zipu onye-agha nēche nche, nye ya iwu ibaute isi-ya: o we je we bipu isi-ya n'ulo-nkpọrọ,

28. we bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we nye ya nne-ya.

29. Mb͕e ndi nēso uzọ-ya nuru ya, ha we bia būru ozu-ya, tọb͕ọ ya n'ílì.

30. Ndi-ozi Jisus we zukọ n'ebe Jisus nọ; ha we kọrọ Ya ihe nile, ka ihe ha mere ra, ka ihe ha ziri ra kwa.

31. O we si ha, Unu onwe-unu bia ichè n'ebe bu ọhia, ka unu zuru ike nke-ntà. N'ihi na ọtutu madu nābia nāla kwa, oghere adighi kwa ha ọbuná iri ihe.

32. Ha we je n'ub͕ọ-ha iche rue ebe bu ọhia.

33. Ma ọtutu madu huru ha mb͕e ha nēje, ha mata-kwa-ra ha, we si n'obodo ahu nile b͕akọta n'ebe ahu n'ukwu ala, buru ha uzọ.

34. O we puta, hu oké ìgwé madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, n'ihi na ha di ka aturu nēnweghi onye nāzù ha: O we malite izí ha ọtutu ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 6