Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 5:18-37 Bible Nso (IGBOB)

18. Mb͕e Ọ nābà nime ub͕ọ, onye ahu ndi-mọ ọjọ jiri na mbu we riọ Ya ka ya na Ya biri.

19. Ma O kweghi ya, kama Ọ si ya, La n'ulo-gi, lakuru ndi nke gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Onye-nwe-ayí meworo gi, na otú O mere gi ebere.

20. O we je, malite ikwusa na Dekapọlis ihe Jisus mere ya, ka ha ra: o we ju madu nile anya.

21. Mb͕e Jisus gasiri ọzọ n'ub͕ọ ahu n'ofè ọzọ, oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ: O we nọ n'usọ oké osimiri.

22. Otù nime ndi-isi ulo-nzukọ, aha-ya bu Jeairọs, we bia; mb͕e ọ huru Ya, o we da n'ala n'ukwu-Ya,

23. we riọsie Ya ike, si, Nwam nwanyi ntà nānwunyu anya: ariọm I ka I bia bikwasi ya aka-Gi abua, ka ewe zọputa ya, o we di ndu.

24. O we so ya je; oké ìgwè madu we nēso Ya, ha nākpab͕u kwa Ya.

25. Otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua,

26. nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n'aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ,

27. ebe ọ nuru ihe nile banyere Jisus, o we bia n'azu Ya n'etiti ìgwè madu ahu, we metu uwe-Ya aka.

28. N'ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam.

29. Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n'aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n'ajọ ọria ahu.

30. Ngwa ngwa, ebe Jisus mazuru na ike nke nēsi nime Ya puta apuwori, O chigharia n'ìgwè madu ahu, we si, Ònye meturu uwem aka?

31. Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, I huwo ìgwè madu a ka ha nākpab͕u Gi, I nāsi kwa, Ònye meturum aka?

32. O we le anya gburugburu ka Ọ hu nwanyi nke mere ihe a.

33. Ma nwanyi ahu, ebe ọ matara ihe emere ya-ri, ọ tua egwu, ma kwa jijiji, bia da n'iru Ya, gwa Ya ezi-okwu nile.

34. Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.

35. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, ha si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwanyi anwuruwo: gini mere i nēsob͕u Onye-ozizí a ọzọ kwa?

36. Ma Jisus aṅaghi nti n'okwu anēkwu, Ọ si onye-isi ulo-nzukọ ahu, Atula egwu, kwere nání.

37. O kweghi kwa onye ọ bula so Ya je, ma-ọbughi Pita, na Jemes, na Jọn nwa-nne Jemes.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 5