Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 4:8-20 Bible Nso (IGBOB)

8. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, nētó nāba kwa uba; ha we mia, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.

9. O we si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

10. Mb͕e nání Ya nọ, ndi nọ Ya buruburu na ndikom iri na abua ahu we jua Ya ilu ahu.

11. O we si ha, Ọ bu unu ka enyeworo ihe-omimi ala-eze Chineke: ma anēmere ndi nọ n'èzí ihe nile n'ilu:

12. ka ha we hu n'ọhuhu, ghara ihuta; ka ha we nu kwa n'ọnunu, ghara inuta; ka ha ghara ichighari mb͕e ọ bula, ewe gb͕aghara ha.

13. O we si ha, Ùnu amataghi ilu a? ùnu gēsi kwa aṅa mara ilum nile?

14. Ọgha-nkpuru nāgha okwu Chineke.

15. Ma ndia bu ndi nọ n'akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha.

16. Otú ahu, ndia bu kwa ndi anāgha n'ebe nkume ahu, ndi, mb͕e ọ bula ha nuru okwu ahu, ngwa ngwa ha were ọṅù jide ya;

17. ma ha enweghi nkpọrọgwu nime onwe-ha, kama ha nānọ nwa oge; emesia, mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ha ma n'ọnyà.

18. Ndi ọzọ bu kwa ndi anāgha n'etiti ogwu ahu; ndia bu ndi nuru okwu ahu,

19. ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

20. Ndi ahu bu kwa ndi aghara n'ala ahu di nma; ndi ọ bula ndi nānu okwu ahu, we nara ya, we mia nkpuru, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 4