Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 3:30-35 Bible Nso (IGBOB)

30. n'ihi na ha nāsi, O nwere mọ nādighi ọcha.

31. Nne-Ya na umu-nne-Ya abia kwa; ha we guzo n'èzí, zigara Ya ozi, nākpọ Ya.

32. Ìgwè madu nānọ kwa Ya buruburu; ha we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nọ n'èzí nāchọ Gi.

33. O we za ha, si, Ònye bu nnem na umu-nnem?

34. Mb͕e O lesiri ha anya buruburu, bú ndi nọ Ya buruburu, Ọ si, Le, nnem na umu-nnem!

35. N'ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Chineke nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 3