Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 3:21-35 Bible Nso (IGBOB)

21. Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n'ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma.

22. Ndi-ode-akwukwọ ndi si na Jerusalem ridata we si, O nwere Beelzebul; ha si kwa, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

23. O we kpọ ha biakute Ya, si ha n'ilu di iche iche, Sètan Si aṅa pu ichupu Setan?

24. Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo.

25. Ọ buru kwa na èzí-na-ulo ekewa megide onwe-ya, èzí-na-ulo ahu agaghi-apu iguzo.

26. Ọ buru kwa na Setan ebiliwo megide onwe-ya, we kewa, ọ pughi iguzo, kama o nwere ọgwugwu.

27. Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.

28. N'ezie asim unu, Na agāb͕aghara umu madu nmehie-ha nile, na nkwulu-ha, ka ha ra, bú nke ha gēji kwulu:

29. ma onye ọ bula nke gēkwulu Mọ Nsọ enweghi nb͕aghara rue mb͕e ebighi-ebi, ma nmehie ebighi-ebi nātuhi ya:

30. n'ihi na ha nāsi, O nwere mọ nādighi ọcha.

31. Nne-Ya na umu-nne-Ya abia kwa; ha we guzo n'èzí, zigara Ya ozi, nākpọ Ya.

32. Ìgwè madu nānọ kwa Ya buruburu; ha we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nọ n'èzí nāchọ Gi.

33. O we za ha, si, Ònye bu nnem na umu-nnem?

34. Mb͕e O lesiri ha anya buruburu, bú ndi nọ Ya buruburu, Ọ si, Le, nnem na umu-nnem!

35. N'ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Chineke nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 3