Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 2:8-19 Bible Nso (IGBOB)

8. Ngwa ngwa ebe Jisus mazuru nime mọ-Ya na ha nātule okwu nime onwe-ha otú a, Ọ si ha, Gini mere unu nātule ihe ndia n'obi-unu?

9. Òle nke ka nfe, isi onye akuku-aru-ya nwuru anwu, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, chiri ute-gi, jeghari kwa?

10. Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie, (Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu),

11. M'si gi, Bilie, chiri ute-gi, la n'ulo-gi.

12. O we bilie, chiri ute-ya ngwa ngwa, pua n'iru ha nile; nke mere ka ibobo nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula ayi huru ya otú a.

13. O we pua ọzọ ga n'usọ oké osimiri; ìgwè madu ahu nile we nābiakute Ya, Ọ nēzí kwa ha ihe.

14. Mb͕e Ọ nāga, Ọ hu Livai nwa Alfiọs, ka ọ nọduru n'ulọ-ùtú, Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya

15. O rue, na Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, ọtutu ndi ọna-utu na ndi-nmehie so-kwa-ra Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri: n'ihi na ha di ọtutu, ha nēso kwa Ya.

16. Mb͕e ndi-ode-akwukwọ di n'etiti ndi-Farisi huru na O nēso ndi-nmehie na ndi-ọna-utu ahu eri ihe, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, Gini mere Ọ nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ahu eri ihe?

17. Mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma: abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.

18. Ndi nēso uzọ Jọn na ndi-Farisi nēbu kwa ọnu: ha we bia, si Ya, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ Jọn na ndi nēso uzọ ndi-Farisi nebu ọnu, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu?

19. Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru ibū ọnu mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ka oge ra ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ ha apughi ibū ọnu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 2