Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 2:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. O we bilie, chiri ute-ya ngwa ngwa, pua n'iru ha nile; nke mere ka ibobo nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke, si, Ọ dighi mb͕e ọ bula ayi huru ya otú a.

13. O we pua ọzọ ga n'usọ oké osimiri; ìgwè madu ahu nile we nābiakute Ya, Ọ nēzí kwa ha ihe.

14. Mb͕e Ọ nāga, Ọ hu Livai nwa Alfiọs, ka ọ nọduru n'ulọ-ùtú, Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya

15. O rue, na Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, ọtutu ndi ọna-utu na ndi-nmehie so-kwa-ra Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri: n'ihi na ha di ọtutu, ha nēso kwa Ya.

16. Mb͕e ndi-ode-akwukwọ di n'etiti ndi-Farisi huru na O nēso ndi-nmehie na ndi-ọna-utu ahu eri ihe, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, Gini mere Ọ nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ahu eri ihe?

17. Mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma: abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.

18. Ndi nēso uzọ Jọn na ndi-Farisi nēbu kwa ọnu: ha we bia, si Ya, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ Jọn na ndi nēso uzọ ndi-Farisi nebu ọnu, ma ndi nēso uzọ-Gi adighi-ebu ọnu?

19. Jisus we si ha, Umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu, ọ̀ gābu na ha puru ibū ọnu mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? ka oge ra ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ ha apughi ibū ọnu.

20. Ma ubọchi gābia, mb͕e agānapu ha Onye nālu nwunye ohu, mb͕e ahu ka ha gēbu kwa ọnu n'ubọchi ahu.

21. Ọ dighi onye ọ bula nēwere iberibe ákwà ọb͕ub͕a ọhu dukọta n'uwe ochie: eme otú a, nke kwesiri imechi ya nādọkapu ihe n'aru-ya, nke-ọhu nādọkapu n'aru nke-ochie, ndọka jọkariri njọ aputa.

22. Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie: eme otú a, manya-vine gāb͕awa karama-akpukpọ ahu, manya-vine na karama-akpukpọ ala kwa n'iyì: ma anāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 2