Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 15:31-47 Bible Nso (IGBOB)

31. Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ nēme Ya ihe-ọchì n'etiti onwe-ha, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya.

32. Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.

33. Mb͕e o ruru oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n'ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete.

34. N'oge hour nke-iteghete Jisus we were oké olu tie nkpu, si, Eloi, Eloi, lama sabaktani? nke bu, ma asugharia ya, Chinekem, Chinekem, gini mere I ji rapu nání Mu?

35. Ufọdu n'etiti ndi guzoro nso, mb͕e ha nuru ya, ha we si, Le, Ọ nākpọ Elaija

36. Otù onye we b͕a ọsọ, were manya-vine b͕ara uka b͕aju sponge, tukwasi ya n'amì, nye Ya ka Ọ ṅua, si, Rapunu; ka ayi hu ma Elaija nābia iwedata Ya n'obe.

37. Ma Jisus mere ka olu-Ya dasie ike, O we kubìe ume.

38. Ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa iberibe abua site n'elu rue ala.

39. Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nke guzoro nso na ncherita-iru Ya, huru na O kubìri ume otú a, ọ si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.

40. Ndinyom di kwa ndi nọ n'ebe di anya nēkiri: n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes nke-ntà na Joses, na Salomi, nọ;

41. ndi nēso Ya mb͕e Ọ nọ na Galili, nēje-kwa-ra Ya ozi; na ọtutu ndinyom ọzọ ndi soro Ya rigoro Jerusalem.

42. Mb͕e o ruru anyasi ub͕u a, ebe ọ bu Nkwadebe, nke bu ubọchi buru ubọchi-izu-ike uzọ,

43. Josef nke Arimatia we bia, onye bu onye-nnọkọ-ikpé onye anāsọpuru, onye ya onwe-ya nēche kwa ala-eze Chineke; o were anya-ike bakuru Pailat, riọ aru Jisus.

44. O we ju Pailat anya ma ọ buru na Ọ nwuruwori: o we kpọ ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise biakute ya, ọ jua ya ma ọ di anya mb͕e Ọ nwuru.

45. Mb͕e ọ matara site n'ọnu ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, o we rara ozu Jisus nye Josef n'efu.

46. O we zuta ezi ákwà ọcha; mb͕e o budatasiri Ya, o we ke Ya n'ezi ákwà ọcha ahu, tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwarari n'oké nkume; o we kpọre otù nkume kwachie ọnu-uzọ ílì ahu.

47. Ma Meri Magdalini na Meri nne Joses huru ebe atọb͕ọrọ Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 15