1. Ngwa ngwa n'ututu ndi-isi-nchu-àjà, ha na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, na nnọkọ-ikpé dum, b͕ara ìzù, we ke Jisus ab͕u, kupu Ya je, rara Ya nye n'aka Pailat.
2. Pailat we jua Ya, si, Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru.
3. Ndi-isi-nchu-àjà we nēbo Ya ọtutu ebubo.
4. Pailat we ju kwa Ya ọzọ, si, Ì zaghi ihe ọ bula? le ka ọtutu ihe ha nēbo Gi ra.
5. Ma Jisus azaghi ihe ọ bula ọzọ; ya mere na o juru Pailat anya.
6. Ma n'ememe ọ nārapuru ha otù onye-nkpọrọ, onye ha nāriọ n'aka-ya.
7. Ma otù onye di anākpọ Barabas, onye ekereri ab͕u, ya na ndi biliri imegide ndi-isi, madu ndi b͕u-kwa-ra madu na nbili ahu.