Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 15:1-13 Bible Nso (IGBOB)

1. Ngwa ngwa n'ututu ndi-isi-nchu-àjà, ha na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, na nnọkọ-ikpé dum, b͕ara ìzù, we ke Jisus ab͕u, kupu Ya je, rara Ya nye n'aka Pailat.

2. Pailat we jua Ya, si, Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru.

3. Ndi-isi-nchu-àjà we nēbo Ya ọtutu ebubo.

4. Pailat we ju kwa Ya ọzọ, si, Ì zaghi ihe ọ bula? le ka ọtutu ihe ha nēbo Gi ra.

5. Ma Jisus azaghi ihe ọ bula ọzọ; ya mere na o juru Pailat anya.

6. Ma n'ememe ọ nārapuru ha otù onye-nkpọrọ, onye ha nāriọ n'aka-ya.

7. Ma otù onye di anākpọ Barabas, onye ekereri ab͕u, ya na ndi biliri imegide ndi-isi, madu ndi b͕u-kwa-ra madu na nbili ahu.

8. Ìgwè madu ahu we rigo, malite iriọ ya ka o me dika ọ nēmere ha.

9. Pailat we za ha, si, Ùnu nāchọ ka m'rapuru unu Eze ndi-Ju?

10. N'ihi na ọ mara na ndi-isi-nchu-àjà rara Ya-ri nye n'ihi ekworo.

11. Ma ndi-isi-nchua-àjà kwaliri ìgwè madu ahu, ka ọ rapuru-ha Barabas kari Jisus.

12. Ma Pailat za kwa-ra ọzọ, si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Onye ahu unu nākpọ Eze ndi-Ju?

13. Ma ha ti-kwa-ra nkpu ọzọ, si, Kpọgide Ya n'obe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 15