Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 14:51-56 Bible Nso (IGBOB)

51. Ma otù okorọbia sonyere Ya, onye b͕okwasiri ezi ákwà ọcha n'aru ọtọ ya: ha we jide ya:

52. ma ọ rapuru ezi ákwà ọcha ahu, b͕ara ọtọ, b͕alaga.

53. Ha we si n'ebe ahu duru Jisus jekuru onye-isi-nchu-àjà: ha nile, bú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, we b͕akọ n'ebe ọ nọ.

54. Pita soro kwa Ya-ri n'ebe di anya, rue nime ulo, nime obí onye-isi-nchu-àjà; ọ nānọdu kwa n'etiti ndi nēje ozi, ọ nānya ọku n'ihè ọku.

55. Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà imegide Jisus ime ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi.

56. N'ihi na ọtutu madu nāb͕a àmà ugha imegide Ya, àmà-ha abughi kwa otù.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 14