Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 14:37-48 Bible Nso (IGBOB)

37. O we bia, hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Saimon, ì nāraru ura? ì nweghi ike iche nche otù oge hour?

38. Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike.

39. O we rapu ha je kwa ọzọ, kpe ekpere, nēkwu otù okwu ahu.

40. O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di oké arọ́; ha amataghi kwa ihe ha gāza Ya.

41. O we bia ọbibia nke-atọ, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: o zuwo: oge hour nkem eruwo; le, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie.

42. Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso.

43. Ngwa ngwa, mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, biara, ya na ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye nọ.

44. Ma onye nārara Ya nye nyere ha-ri ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya; jidenu Ya, lezienu anya duru Ya je.

45. Mb͕e ọ biara, ngwa ngwa ọ biakutere Ya, si, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku.

46. Ha we tukwasi Ya aka, jide Ya.

47. Ma otù onye n'etiti ndi guzoro nso miputara mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti-ya.

48. Jisus we za, si ha, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 14