Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 14:23-32 Bible Nso (IGBOB)

23. O we nara iko, kele kwa, we nye ha: ha nile we ṅua nime ya.

24. O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n'ihi ọtutu madu.

25. N'ezie asim unu, M'gaghi-aṅu kwa ma-ọli n'ihe si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M'gāṅu ya ọhu n'ala-eze Chineke.

26. Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.

27. Jisus we si ha, Agēme ka unu nile ma n'ọnyà: n'ihi na edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu-Ya.

28. Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili.

29. Ma Pita siri Ya, Ọ buru na agēme ọbuná madu nile ka ha ma n'ọnyà, ma agaghi-eme mu onwem.

30. Jisus we si ya, N'ezie asim gi, na ta, bú n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá ub͕ò abua, i gāgọnaririn ub͕ò atọ.

31. Ma ọ nēkwusi ike nke-uku, si, Ọ buru na ọ di nkpà ka m'so Gi nwua, m'gaghi-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ha nile kwuru.

32. Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'nēkpe ekpere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 14