Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 14:18-32 Bible Nso (IGBOB)

18. Mb͕e ha nānọdu na nri nēri kwa ihe, Jisus we si, N'ezie asim unu, Otù onye si n'etiti unu puta gāraram nye, bú onye Mu na ya nēri ihe.

19. Ọ malitere iwuta ha, ha malite-kwa-ra isi Ya n'otù, Ọ̀ bu mu?

20. Ma Ọ siri ha, Ọ bu otù onye nime unu iri na abua, onye nke Mu na ya nēsukọ nri n'afere.

21. N'ihi na Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ banyere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.

22. Mb͕e ha nēri ihe, O we nara ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, nye ha, si, Naranu: nka bu arum.

23. O we nara iko, kele kwa, we nye ha: ha nile we ṅua nime ya.

24. O we si ha, Nka bu ọbaram nke ọb͕ub͕a-ndu, nke anāwusì n'ihi ọtutu madu.

25. N'ezie asim unu, M'gaghi-aṅu kwa ma-ọli n'ihe si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e M'gāṅu ya ọhu n'ala-eze Chineke.

26. Mb͕e ha bùsiri abù, ha pua je ugwu Olive.

27. Jisus we si ha, Agēme ka unu nile ma n'ọnyà: n'ihi na edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, M'gētib͕u Onye-ọzùzù-aturu, agāb͕asa kwa aturu-Ya.

28. Ma mb͕e emere ka M'si n'ọnwu bilie, M'gēburu unu uzọ ga Galili.

29. Ma Pita siri Ya, Ọ buru na agēme ọbuná madu nile ka ha ma n'ọnyà, ma agaghi-eme mu onwem.

30. Jisus we si ya, N'ezie asim gi, na ta, bú n'abali a, mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ákwá ub͕ò abua, i gāgọnaririn ub͕ò atọ.

31. Ma ọ nēkwusi ike nke-uku, si, Ọ buru na ọ di nkpà ka m'so Gi nwua, m'gaghi-agọnari Gi ma-ọli. Ọ bu kwa otú a ka ha nile kwuru.

32. Ha we biarue ogige nke aha-ya bu Getsemane: O we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'nēkpe ekpere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 14