Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 13:28-37 Bible Nso (IGBOB)

28. Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso;

29. otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzo.

30. N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme.

31. Elu-igwe na uwa gagabiga: ma okuwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.

32. Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amat'aghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.

33. Lezienu anya, murunu anya, nēkpe-kwa-nu ekpere: n'ihi na unu amataghi mb͕e oge ahu bu.

34. Ọ di ka mb͕e madu, onye jere inọdu n'ala ndi ọzọ, ebe ọ rapuru ulo-ya, nye kwa ndi-orù-ya ọlu ichi-isi, nye onye ọ bula nime ha ọlu-ya, o nye-kwa-ra onye-ọnu-uzọ iwu ka ọ che nche.

35. Ya mere, nēchenu nche: n'ihi na unu amataghi mb͕e Onye-nwe ulo gābia, ma ọ bu n'anyasi, ma-ọbu n'etiti abali, ma-ọbu mb͕e oke-ọkuku kwara, ma-ọbu n'ututu;

36. ka O we ghara ihu unu ka unu nāraru ura, ma ọ buru na Ọ bia na mberede.

37. Ma okwu M'nāgwa unu ka M'nāgwa madu nile, Nēchenu nche.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 13