14. Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n'efu, ka ọ nēguzo n'ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu:
15. onye nọ kwa n'elu ulo, ya ghara iridata, ma-ọbu ibà nime, ikwapu ihe ọ bula n'ulo-ya:
16. onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe-ya.
17. Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.
18. Ma kpenu ekpere ka ọ ghara idi na mb͕e oyi.
19. N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli.
20. Ọ buru kwa na Onye-nwe-ayi emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara, ndi Ọ rọputara, O mere ka ubọchi ahu di nkpirikpi.
21. Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a; ma-ọbu, Le, n'ebe ahu; unu ekwela:
22. n'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche, ka ha we duhie ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me.
23. Ma unu onwe-unu lezie anya: le, agwawom unu ihe nile mb͕e akēmeghi ha.
24. Ma na mb͕e ahu, mb͕e nkpab͕u ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ihè-ya,