Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 12:36-44 Bible Nso (IGBOB)

36. Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ,Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,Nọdu ala n'aka-nrim,Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

37. Devid onwe-ya nākpọ Ya Onye-nwe-ya; òle ebe O si buru kwa Nwa-ya? Oké ìgwè madu ahu we were obi-utọ nu okwu-Ya.

38. N'ozizi-Ya Ọ si kwa, Lezienu anya ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, na inara ekele n'ọma-ahia nile unu,

39. na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu, na isi ọnọdu nile n'oriri nile unu:

40. ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya; ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara ókè kari ndi ọzọ.

41. O we nọdu n'ulo uku Chineke na ncherita-iru ebe anēdebe ùtú anātu, O we nēle otú ìgwè madu nātubà ego n'ebe ùtú ahu: ọtutu ndi bu ọgaranya nātubà kwa ri nne.

42. Otù nwayi, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, we bia, tubà ego ntà abua, nke mere otù farthing.

43. O we kpọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, Ọ si ha, N'ezie asim unu, Nwanyi a, bú ob͕enye, nke di-ya nwuru, ọ tubàra kari ndi nile nātubà nime ebe ùtú ahu:

44. n'ihi na ha nile sitere n'inwebiga-àkù-ókè-ha tubà; ma nwanyi ahu sitere n'ukọ-ya tubà ka ihe nile nke o nwere ra, bú ihe dum o ji biri.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 12