Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 12:33-40 Bible Nso (IGBOB)

33. na ihu Ya n'anya site n'obi-gi dum, site kwa na nghọta-gi dum, site kwa n'ike-gi dum, na ihu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi, ọ kachasi àjà-nsuresi-ọku nile na àjà ọzọ nile nke-uku.

34. Mb͕e Jisus huru na ọ zara dika onye nwere uche, Ọ si ya, I nọghi ebe di anya n'ala-eze Chineke. Ma ọ dighi onye nwere anya-ike site na mb͕e ahu iju Ya ajuju.

35. Jisus we za, mb͕e Ọ nēzi ihe n'ulo uku Chineke, si, Ndi-ode-akwukwọ si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?

36. Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ,Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,Nọdu ala n'aka-nrim,Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

37. Devid onwe-ya nākpọ Ya Onye-nwe-ya; òle ebe O si buru kwa Nwa-ya? Oké ìgwè madu ahu we were obi-utọ nu okwu-Ya.

38. N'ozizi-Ya Ọ si kwa, Lezienu anya ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, na inara ekele n'ọma-ahia nile unu,

39. na isi oche nile n'ulo-nzukọ-unu, na isi ọnọdu nile n'oriri nile unu:

40. ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya; ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara ókè kari ndi ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 12