Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 11:22-33 Bible Nso (IGBOB)

22. Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke.

23. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya.

24. Ya mere M'ji si unu, Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n'ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu.

25. Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu.

26. Ma ọ buru na unu onwe-unu ab͕agharaghi, Nna-unu Nke bi n'elu-igwe agaghi-ab͕aghara unu ndahie nile unu.

27. Ha we bia rue Jerusalem ọzọ: mb͕e Ọ nējeghari n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye we biakute Ya;

28. ha we si Ya, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye nyere Gi ike a ka I we me ihe ndia?

29. Ma Jisus siri ha, M'gāju unu otù okwu, unu zakwam, emesia M'gāgwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.

30. Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na ò sitere n'aka madu? zanum.

31. Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gasi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya?

32. Ma àyi gāsi kwa, O sitere n'aka madu? ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na madu nile guru Jọn na ọ bu onye-amuma n'ezie.

33. Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 11