Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 10:37-47 Bible Nso (IGBOB)

37. Ha we si Ya, Me ayi ka ayi nọdu, otù n'aka-nri-Gi, otù n'aka-ekpe, n'ebube-Gi.

38. Ma Jisus siri ha, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem nāṅu? ma-ọbu ka eme unu baptism ahu dika anēme Mu onwem?

39. Ha we si Ya, Ayi puru. Jisus we si ha, Iko Mu onwem nāṅu ka unu gaṅu; baptism nke anēme Mu onwem ka agēme kwa unu:

40. ma inọdu n'aka-nrim ma-ọbu n'aka-ekpem abughi nkem inye: kama ọ diri ndi edoziworo ya.

41. Mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya iwe we malite iwe ha nke-uku n'ihi Jemes na Jọn.

42. Jisus we kpọ ha biakute Ya, si ha, Unu amatawo na ndi aguru ibu ndi-isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi uku ha nāchi kwa ha.

43. Ma ọ dighi otú a n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi:

44. ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gabu orù unu nile.

45. N'ihi na Nwa nke madu Onwe-ya abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.

46. Ha we bia rue Jeriko: mb͕e Ọ nāputa na Jeriko, Ya na ndi nēso uzọ-Ya na oké ìgwè madu, nwa-nwoke Timiọs, bú Bātimiọs, onye-aririọ kpuru ìsì, nānọdu n'akuku uzọ.

47. Mb͕e ọ nuru na ọ bu Jisus Onye Nazaret, o we malite íti nkpu, na isi, Nwa Devid, Jisus, merem ebere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 10