Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 10:26-36 Bible Nso (IGBOB)

26. Ma ibobo nwubigara ha ókè n'aru, ha sirita onwe-ha, Onye kwa ka apuru izọputa?

27. Jisus lere ha anya, si, N'ebe madu nọ ọ bu ihe anāpughi íme, ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ n'ihi na apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ.

28. Pita malitere isi Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, ayi esowo kwa Gi.

29. Jisus siri, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne-ndikom, ma-ọbu umu-nne-ndinyom, ma-ọbu nne, ma-ọbu nna, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihim, na n'ihi ozi ọma nkem,

30. ma-ọbughi na ọ gānata ọgu ise ọgu ise ub͕u a n'oge a, ulo, na umu-nne-ndikom, na umu-nne-ndinyom, na nne, na umu, na ubi, ha na nsob͕u; ọ gānata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia.

31. Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi-ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ.

32. Ma ha nọ n'uzọ, nārigoro Jerusalem; Jisus we nāga n'iru ha: ibobo nwu-kwa-ra ha n'aru; ma ndi nēso Ya nātu egwu. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya ọzọ, malite igwa ha ihe nile gaje ime Ya,

33. si, Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpe ọnwu, rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ:

34. ha gēme kwa Ya ihe-ọchi, busa Ya ọnu-miri, pia Ya ihe, b͕ue Ya: Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.

35. Jemes na Jọn, bú umu Zebedi, we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, ayi nāchọ ka I mere ayi ihe ọ bula ayi gāriọ Gi.

36. O we si ha, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 10