Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 10:13-28 Bible Nso (IGBOB)

13. Ha we kutara Ya umu-ntakiri, ka O we metu ha aka: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.

14. Ma mb͕e Jisus huru ya, iwe were Ya nke-uku, Ọ si ha, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem; unu eb͕ochila ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.

15. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli.

16. O we kuru ha n'aka-Ya, bikwasi ha aka-Ya abua, we gọzie ha nke-ọma.

17. Mb͕e ọ nāpu n'uzọ, otù onye we b͕akuru Ya, b͕uru Ya ikperè, jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?

18. Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.

19. I matawo ihe nile enyere n'iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi.

20. Ma ọ siri Ya, Onye-ozizí, ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia.

21. Ma mb͕e Jisus lere ya anya Ọ hu ya n'anya, si ya, Otù ihe fọduru gi ime: laba, re ka ihe i nwere ra, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.

22. Ma iru-ya b͕aruru n'okwu a, o we la na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne.

23. Jisus we le anya buruburu, si ndi nēso uzọ-Ya, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke!

24. Ma ibobo okwu-Ya nile nwuru ndi nēso uzọ-Ya n'aru. Ma Jisus za-kwa-ra ọzọ, si ha, Umum, le otú ọ diri ha ike ibà n'ala-eze Chineke, bú ndi wereworo obi-ha tukwasi n'àkù!

25. Ọ dikariri camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke.

26. Ma ibobo nwubigara ha ókè n'aru, ha sirita onwe-ha, Onye kwa ka apuru izọputa?

27. Jisus lere ha anya, si, N'ebe madu nọ ọ bu ihe anāpughi íme, ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ n'ihi na apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ.

28. Pita malitere isi Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, ayi esowo kwa Gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 10