26. Mọ ahu nādighi ọcha we se ya, were kwa oké olu kpọ nkpu, we si nime ya puta.
27. Ibobo we nwua ha nile n'aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n'ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti.
28. Ngwa ngwa ewe kọsa akukọ-Ya ebe nile n'ala dum di Galili gburugburu.
29. Ngwa ngwa, mb͕e ha putasiri n'ulo-nzukọ ahu, ha we ba n'ulo Saimon na Andru, ha na Jemes na Jọn.
30. Ma nne nwunye Saimon nēdina n'aru-ọku; ngwa ngwa ha we gwa Ya okwu bayere nwanyi ahu:
31. O we jekuru ya, jide ya n'aka, palie ya; aru-ọku ahu we rapu ya, ọ nējere ha ozi.
32. Ma mb͕e o ruru anyasi, mb͕e anyanwu dara, ha nēkutara Ya ndi aru nādighi nma, na ndi mọ ọjọ ji
33. Obodo ahu dum we zukọ n'ọnu-uzọ.
34. O we me ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi aru nādighi nma n'ọria di iche iche, Ọ chupu kwa ọtutu ndi-mọ ọjọ; O kweghi kwa ndi-mọ ọjọ kwue okwu, n'ihi na ha matara Ya.
35. O we bilie n'isi-ututu, n'ezi abali, pua, je n'ebe bu ọhia, nọ nēkpe ekpere n'ebe ahu.
36. Saimon na ndi ya na ha nọ we b͕aso Ya;
37. ha we chọta Ya, si Ya, Madu nile nāchọ Gi.