Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 1:16-30 Bible Nso (IGBOB)

16. Mb͕e Ọ nāga n'usọ oké osimiri Galili, O we hu Saimon na Andru nwa-nne Saimon ka ha nāwuye úb͕ú n'oké osimiri: n'ihi na ha bu ndi-ọkù.

17. Jisus we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme kwa ka unu buru ndi-ọkù nākuta madu.

18. Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya.

19. Mb͕e Ọ gara n'iru nke-ntà, O we hu Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, ndi nọ kwa n'ub͕ọ, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù.

20. Ngwa ngwa O we kpọ ha: ha we rapu nna-ha Zebedi n'ub͕o, ya na ndi-ọlu egoro ego, ha je so Ya n'azu.

21. Ha we ga ba na Kapanaum; ngwa ngwa O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike we nēzí ihe.

22. Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ.

23. Ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we nọ n'ulo-nzukọ-ha; o we tisie nkpu ike,

24. si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.

25. Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta.

26. Mọ ahu nādighi ọcha we se ya, were kwa oké olu kpọ nkpu, we si nime ya puta.

27. Ibobo we nwua ha nile n'aru, nke mere ka ha jurita onwe-ha, si, Gini bu nka? ozizí ọhu! ọ bu n'ike ka Ọ nēnye ọbuná ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha nāṅa kwa Ya nti.

28. Ngwa ngwa ewe kọsa akukọ-Ya ebe nile n'ala dum di Galili gburugburu.

29. Ngwa ngwa, mb͕e ha putasiri n'ulo-nzukọ ahu, ha we ba n'ulo Saimon na Andru, ha na Jemes na Jọn.

30. Ma nne nwunye Saimon nēdina n'aru-ọku; ngwa ngwa ha we gwa Ya okwu bayere nwanyi ahu:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 1