Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Mak 1:14-24 Bible Nso (IGBOB)

14. Ma mb͕e arasiiri Jọn nye, Jisus biara na Galili, nēkwusa ozi ọma Chineke,

15. si, Oge ezuwo, ala-eze Chineke di kwa nso: chègharianu, kwe-kwa-nu n'ozi ọma.

16. Mb͕e Ọ nāga n'usọ oké osimiri Galili, O we hu Saimon na Andru nwa-nne Saimon ka ha nāwuye úb͕ú n'oké osimiri: n'ihi na ha bu ndi-ọkù.

17. Jisus we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme kwa ka unu buru ndi-ọkù nākuta madu.

18. Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya.

19. Mb͕e Ọ gara n'iru nke-ntà, O we hu Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, ndi nọ kwa n'ub͕ọ, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù.

20. Ngwa ngwa O we kpọ ha: ha we rapu nna-ha Zebedi n'ub͕o, ya na ndi-ọlu egoro ego, ha je so Ya n'azu.

21. Ha we ga ba na Kapanaum; ngwa ngwa O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike we nēzí ihe.

22. Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ.

23. Ngwa ngwa nwoke nke di n'aka mọ nādighi ọcha we nọ n'ulo-nzukọ-ha; o we tisie nkpu ike,

24. si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Mak 1