Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Luk 8:32-49 Bible Nso (IGBOB)

32. Ma ìgwè ọtutu ezì di n'ebe ahu nāta nri n'ugwu: ha we riọ Ya ka O kwere ha ka ha ba nime ha. O we kwere ha.

33. Ndi-mọ ọjọ ahu we si nime nwoke ahu puta, ba nime ìgwè ezì ahu: ìgwè ezi ahu we nuda n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'ọdọ-miri, miri we b͕ab͕ue ha.

34. Ma mb͕e ndi nāzù ha huru ihe emereri, ha b͕alaga, kọsa ya n'obodo ahu na gburugburu ya nile.

35. Ha we pua ihu ihe emereri; ha we biakute Jisus, we hu nwoke ahu, nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta, ka ọ nọduru ala n'ukwu Jisus, yiri uwe, uche-ya zu-kwa-ra okè: ha we tua egwu.

36. Ndi huru ya we kọrọ ha otú azọputara onye ahu ndi-mọ ọjọ ji.

37. Ọra nile nke ala ndi Gerasa di ya gburugburu we kpere Ya ka O si n'ebe ha nọ la; n'ihi na ha nātu oké egwu: O we ba nime ub͕ọ, laghachi.

38. Ma nwoke nke ndi-mọ ọjọ siri nime ya puta nāriọ Ya ka ya na Ya biri: ma O zilagara ya, si,

39. Laghachi n'ulo-gi, kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke meworo gi. O we je, nēkwusa n'obodo ahu dum ihe Jisus mere ya, ka ha ra.

40. Ma mb͕e Jisus laghachiri, ìgwè madu ahu nara Ya nke-ọma; n'ihi na ha nile nēle anya Ya.

41. Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Jeairọs, biara, ya onwe-ya bu kwa onye-isi ulo-nzukọ: o we da n'ala n'ukwu Jisus, we riọ Ya ka Ọ bia n'ulo-ya;

42. n'ihi na o nwere nwa-nwanyi ọ muru nání ya, nke b͕ara ihe ra ka arọ iri na abua, nwata ahu nānwu kwa anwu. Ma mb͕e Ọ nēje ìgwè madu nile nākpab͕u Ya.

43. Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n'aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike,

44. nwanyi ahu we bia n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo.

45. Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi.

46. Ma Jisus siri, Madu meturum aka: n'ihi na Mu onwem mara na ike esiwori n'arum puta.

47. Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n'iru Ya, kọ n'iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa.

48. Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.

49. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, otù onye si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwayi anwuruwo; esob͕u-kwa-la Onye-ozizí a ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Luk 8